< Job 42 >

1 Så svarede Job HERREN og sagde:
Mgbe ahụ, Job zara Onyenwe anyị sị:
2 "Jeg ved, at du magter alt, for dig er intet umuligt!
“Amara m na ị pụrụ ime ihe niile; ọ dịghị atụmatụ gị nke a pụrụ ikposa.
3 "Hvem fordunkler mit Råd med Ord, som er uden Indsigt?" Derfor: jeg talte uden Forstand om noget, som var mig for underfuldt, og som jeg ej kendte til.
Ị jụrụ sị, ‘Onye bụ onye nke a ji okwu ihe ọmụma na-adịghị na ya na-eme ka atụmatụ m ghara ịpụta ihe?’ Nʼezie, ekwuru m banyere ihe ndị m na-aghọtaghị, ihe ndị dị oke ebube karịa m ịmata.
4 Hør dog, og jeg vil tale, jeg vil spørge, og du skal lære mig!
“Ị sịrị, ‘Gee ntị ugbu a, aga m ekwu okwu; m ga-ajụ gị ajụjụ, gị onwe gị ga-azakwa m.’
5 Jeg havde kun hørt et Rygte om dig, men nu har mit Øje set dig;
Ntị m nụrụ ihe banyere gị ma ugbu a, ejirila m anya abụọ hụ gị.
6 jeg tager det derfor tilbage og angrer i Støv og Aske!
Ya mere, ana m akpọ onwe m asị, na echegharịkwa nʼime ntụ na uzuzu.”
7 Men efter at HERREN havde talet disse Ord til Job, sagde han til Temaniten Elifaz: "Min Vrede er blusset op mod dig og dine to Venner, fordi I ikke talte rettelig om mig som min Tjener Job!
Mgbe Onyenwe anyị gwasịrị Job okwu, ọ tụgharịrị gwa Elifaz onye Teman okwu sị ya, “Ana m ewesa gị na ndị enyi gị abụọ iwe, nʼihi na ihe unu kwuru banyere m ezighị ezi dịka nke ohu m Job kwuru.
8 Tag eder derfor syv Tyre og syv Vædre og gå til min Tjener Job og bring et Brændoffer for eder. Og min Tjener Job skal gå i Forbøn for eder, thi ham vil jeg bønhøre, så jeg ikke gør en Ulykke på eder, fordi I ikke talte rettelig om mig som min Tjener Job!"
Ugbu a, werenụ oke ehi asaa na ebule asaa, jekwuru ohu m bụ Job ka o jiri ha chụọrọ unu aja nsure ọkụ, ohu m bụ Job ga-ekpekwara unu ekpere. Aga m anabatakwa ekpere ọ ga-ekpe nʼihi unu. Agaghị m alakwa unu nʼiyi nʼihi okwu nzuzu unu. Unu ekwughị ihe ziri ezi banyere m dịka ohu m Job si kwuo.”
9 Så gik Temaniten Elifaz, Sjuhiten Bildad og Na'amatiten Zofar hen og gjorde, som HERREN havde sagt, og HERREN bønhørte Job.
Ya mere, Elifaz onye Teman, na Bildad, onye Shu, na Zofa, onye Naaman mere dịka Onyenwe anyị si nye ha nʼiwu. Onyenwe anyị nabatakwara ekpere nke Job kpere nʼihi ndị enyi ya.
10 Og HERREN vendte Jobs Skæbne, da han gik i Forbøn for sine Venner; og HERREN gav Job alt, hvad han havde ejet, tvefold igen.
Mgbe Job kpesịrị ekpere maka ndị enyi ya, Onyenwe anyị mekwara ka ọ baa ụba ọzọ. O nyekwara ya okpukpo abụọ nke ihe niile o nwere na mbụ.
11 Så kom alle hans Brødre og Søstre og alle, der kendte ham tilforn, og holdt Måltid med ham i hans Hus, og de viste ham deres Medfølelse og trøstede ham over al den Ulykke, HERREN havde bragt over ham, og de gav ham hver en Kesita og en Guldring.
Mgbe ahụ, ụmụnne ya ndị ikom na ụmụnne ya ndị inyom, na ndị enyi ya niile bịara soro ya rie oriri nʼụlọ ya, na-akasị ya obi nʼihi iru ụjụ ya niile. Ha kasịkwara ya obi nʼihi ọnwụnwa niile Onyenwe anyị mere ka ọ bịakwasị ya. Ha niile nʼotu nʼotu nyere ya onyinye ọlaọcha na mgbaaka ọlaedo.
12 Og HERREN velsignede Jobs sidste Tid mere end hans første. Han fk 14000 Stykker Småkvæg, og 1000 Aseninder.
Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gọziri Job nʼoge ikpeazụ nke ndụ ya karịa ka o si gọzie ya na mbụ. Job nwere puku atụrụ iri na anọ na puku ịnyịnya kamel isii na puku ehi abụọ na otu puku ịnyịnya ibu.
13 Og han fik syv Sønner og tre Døtre,
Chineke mekwara ka ọ mụta ụmụ ndị ikom asaa, na ụmụ ndị inyom atọ ọzọ.
14 og han kaldte den ene Jemima, den anden Kezia og den tredje Keren-Happuk.
Ndị a bụ aha ụmụ ya ndị inyom: nke mbụ bụ Jimaịma, nke abụọ bụ Kezaya, ebe nke atọ bụ Kerin-Hapuk.
15 Så smukke Kvinder som Jobs Døtre fandtes ingensteds på Jorden; og deres Fader gav dem Arv imellem deres Brødre:
Nʼala ahụ niile, o nweghị ụmụ agbọghọ mara mma dịka ụmụ ndị inyom Job ndị a. Job mekwara ka ha bụrụ ndị ga-eso ụmụ ya ndị ikom keta oke nʼihe niile o nwere.
16 Siden levede Job 140 År og så sine Børn og Børnebørn, fire Slægtled.
Job nọgidekwara ndụ narị afọ na iri afọ anọ ọzọ. Ọ hụrụ ụmụ ya, na ụmụ ha ruo ọgbọ nke anọ.
17 Så døde Job gammel og mæt af Dage.
Job nwụrụ mgbe o mere ezigbo agadi, ụbọchị ndụ ya jukwara ya afọ.

< Job 42 >