< Προς Εβραιους 2 >

1 δια τουτο δει περισσοτερωσ ημασ προσεχειν τοισ ακουσθεισιν μηποτε παραρρυωμεν
Ya mere, anyị aghaghị ilezi anya nke ọma banyere ihe anyị nụrụla, ka anyị hapụ isi na ha wezuga onwe anyị.
2 ει γαρ ο δι αγγελων λαληθεισ λογοσ εγενετο βεβαιοσ και πασα παραβασισ και παρακοη ελαβεν ενδικον μισθαποδοσιαν
Nʼihi na ọ bụrụ na ozi ahụ e ziri site na ndị mmụọ ozi dị ire, ọ bụrụkwa na njehie maọbụ nnupu isi ọbụla natara ahụhụ kwesiri ya.
3 πωσ ημεισ εκφευξομεθα τηλικαυτησ αμελησαντεσ σωτηριασ ητισ αρχην λαβουσα λαλεισθαι δια του κυριου υπο των ακουσαντων εισ ημασ εβεβαιωθη
Anyị ga-esi aṅaa gbanarị ntaramahụhụ ma ọ bụrụ na anyị eleghara oke nzọpụta ahụ anya? Ọ bụ Onyenwe anyị kwupụtara ya, bụkwa nke ndị nụrụ ya gbaara anyị ama banyere ya.
4 συνεπιμαρτυρουντοσ του θεου σημειοισ τε και τερασιν και ποικιλαισ δυναμεσιν και πνευματοσ αγιου μερισμοισ κατα την αυτου θελησιν
Chineke nʼonwe ya tụkwasịrị ịgba ama nke ya, site nʼịrụ ọrụ ebube na ọrụ ịrịbama, na ọrụ ịtụnanya dị iche iche, nakwa ikesa ọtụtụ onyinye nke Mmụọ Nsọ, dị ka ọchịchọ ya siri dị.
5 ου γαρ αγγελοισ υπεταξεν την οικουμενην την μελλουσαν περι ησ λαλουμεν
Ọ dịghị mgbe Chineke nyere ndị mmụọ ozi ike ịchị elu ụwa a. Anyị na-ekwu banyere ụwa gaje ịbịa abịa.
6 διεμαρτυρατο δε που τισ λεγων τι εστιν ανθρωποσ οτι μιμνησκη αυτου η υιοσ ανθρωπου οτι επισκεπτη αυτον
Otu onye agbaala akaebe nʼebe ọzọ, “Gịnị ka mmadụ bụ i ji na-eche banyere ha? Gịnị ka nwa nke mmadụ bụ iji na-elekọta ya?
7 ηλαττωσασ αυτον βραχυ τι παρ αγγελουσ δοξη και τιμη εστεφανωσασ αυτον
Nʼihi na i mere ka ha dị ala nwantakịrị nʼebe ndị mmụọ ozi nọ; i jikwa ebube na nsọpụrụ kpube ya nʼisi dịka okpueze,
8 παντα υπεταξασ υποκατω των ποδων αυτου εν γαρ τω υποταξαι αυτω τα παντα ουδεν αφηκεν αυτω ανυποτακτον νυν δε ουπω ορωμεν αυτω τα παντα υποτεταγμενα
dokwaa ihe niile nʼokpuru ụkwụ ya.” Mgbe o mere ka ihe niile dịrị nʼokpuru ya, o nwekwaghị ihe ọbụla ọ hapụrụ itinye nʼokpuru ya. Ma otu ọ dị, anyị ahụbeghị ka e doro ihe niile nʼokpuru ya.
9 τον δε βραχυ τι παρ αγγελουσ ηλαττωμενον βλεπομεν ιησουν δια το παθημα του θανατου δοξη και τιμη εστεφανωμενον οπωσ χαριτι θεου υπερ παντοσ γευσηται θανατου
Ma anyị na-ahụ Jisọs bụ onye e mere ka ọ dị ala nwantakịrị oge karịa ndị mmụọ ozi, ma ugbu a ejirila ebube na nsọpụrụ kpukwasị ya nʼisi, nʼihi ahụhụ ọnwụ nke ọ hụrụ, ka o site nʼamara Chineke detụ ọnwụ ire nʼihi mmadụ niile.
10 επρεπεν γαρ αυτω δι ον τα παντα και δι ου τα παντα πολλουσ υιουσ εισ δοξαν αγαγοντα τον αρχηγον τησ σωτηριασ αυτων δια παθηματων τελειωσαι
Ebe e sitere na ya kpọbata ọtụtụ ụmụ nʼebube, o ziri ezi ka Chineke, onye ihe niile dịrị na onye kere ihe niile, mee ka onyeisi nzọpụta ha bụrụ onye zuruoke site nʼahụhụ ọ hụrụ.
11 ο τε γαρ αγιαζων και οι αγιαζομενοι εξ ενοσ παντεσ δι ην αιτιαν ουκ επαισχυνεται αδελφουσ αυτουσ καλειν
Onye ahụ na-eme mmadụ ka ọ dị nsọ, na ndị ahụ e mere ka ha dị nsọ si nʼotu ezinaụlọ. Nʼihi ya, ihere adịghị eme ya ịkpọ ha ụmụnna ya.
12 λεγων απαγγελω το ονομα σου τοισ αδελφοισ μου εν μεσω εκκλησιασ υμνησω σε
Ọ sịrị, “Aga m ekwupụta aha gị nye ụmụnna m, nʼetiti nzukọ ka m ga-anọ bụọrọ gị abụ otuto.”
13 και παλιν εγω εσομαι πεποιθωσ επ αυτω και παλιν ιδου εγω και τα παιδια α μοι εδωκεν ο θεοσ
Ọzọkwa, “Aga m atụkwasị obi m na ya.” Ọzọkwa, ọ sịrị, “Lee mụ onwe m, na ụmụ ndị Chineke nyere m.”
14 επει ουν τα παιδια κεκοινωνηκεν σαρκοσ και αιματοσ και αυτοσ παραπλησιωσ μετεσχεν των αυτων ινα δια του θανατου καταργηση τον το κρατοσ εχοντα του θανατου τουτ εστιν τον διαβολον
Ebe ọ bụ na ụmụ ndị ahụ ketara oke na anụ ahụ na ọbara, ya onwe ya sooro ha keta oke nʼụdịdị ahụ, ka o site nʼọnwụ ya laa onye ahụ nwere ike ọnwụ nʼiyi, onye ahụ bụ ekwensu.
15 και απαλλαξη τουτουσ οσοι φοβω θανατου δια παντοσ του ζην ενοχοι ησαν δουλειασ
Ma tọpụ ndị ahụ niile egwu nke ọnwụ mere ka ha bụrụ ohu na ndụ ha niile.
16 ου γαρ δηπου αγγελων επιλαμβανεται αλλα σπερματοσ αβρααμ επιλαμβανεται
Nʼihi na nʼezie, ọ bụghị ndị mmụọ ozi ka ọ na-enyere aka kama ọ bụ ụmụ ụmụ Ebraham.
17 οθεν ωφειλεν κατα παντα τοισ αδελφοισ ομοιωθηναι ινα ελεημων γενηται και πιστοσ αρχιερευσ τα προσ τον θεον εισ το ιλασκεσθαι τασ αμαρτιασ του λαου
Nʼihi nke a, e mere ka o yie ụmụnna ya nʼihe niile, ka o nwe ike ghọọ onyeisi nchụaja kwesiri ntụkwasị obi ma na nke nwere obi ebere nʼijere Chineke ozi, ka o nweekwa ike chụọ aja ikpuchi mmehie mmadụ niile.
18 εν ω γαρ πεπονθεν αυτοσ πειρασθεισ δυναται τοισ πειραζομενοισ βοηθησαι
Ebe ọ bụ na ya onwe ya tara ahụhụ mgbe a na-anwa ya ọnwụnwa, o nwekwara ike inyere ndị a na-anwa ọnwụnwa aka.

< Προς Εβραιους 2 >