< 雅歌 8 >

1 どうか、あなたは、わが母の乳ぶさを吸ったわが兄弟のようになってください。わたしがそとであなたに会うとき、あなたに口づけしても、だれもわたしをいやしめないでしょう。
O, a sịkwarị na ị bụ nwanne m nwoke; nke otu nne mụrụ mụ na ya m gaara esutu gị ọnụ mgbe anyị zutere nʼokporoụzọ ma ọ dịkwaghị onye ọbụla ga-eleda m anya.
2 わたしはあなたを導いて、わが母の家に行き、わたしを産んだ者のへやにはいり、香料のはいったぶどう酒、ざくろの液を、あなたに飲ませましょう。
Agaara m akpọrọ gị baa nʼụlọ nne m, ka ị nọdụ nʼebe ahụ, nʼụlọ onye ziri m ihe. Agaara m enye gị mmanya e tinyere ihe na-esi isi ụtọ, mmanya ụtọ nke pomegranet.
3 どうか、彼の左の手がわたしの頭の下にあり、右の手がわたしを抱いてくれるように。
Aka ekpe ya dị nʼokpuru isi m, aka nri ya na-ejikụ m.
4 エルサレムの娘たちよ、わたしはあなたがたに誓い、お願いする、愛のおのずから起るときまでは、ことさらに呼び起すことも、さますこともしないように。
Unu ụmụ agbọghọ Jerusalem, ana m agba unu iyi, unu agaghị akpọte maọbụ mee ka ịhụnanya teta tupu ruo mgbe ọ masịrị ya.
5 自分の愛する者によりかかって、荒野から上って来る者はだれですか。りんごの木の下で、わたしはあなたを呼びさました。あなたの母上は、かしこで、あなたのために産みの苦しみをなし、あなたの産んだ者が、かしこで産みの苦しみをした。
Onye bụ onye a si nʼọzara na-abịa, onye na-adabere nʼahụ onye ọ hụrụ nʼanya. Onye a hụrụ nʼanya Nʼokpuru osisi apụl ka m kpọtere gị; nʼebe ahụ ka nne gị tụrụ ime gị; nʼebe ahụ ka ọ nọ mụọ gị.
6 わたしをあなたの心に置いて印のようにし、あなたの腕に置いて印のようにしてください。愛は死のように強く、ねたみは墓のように残酷だからです。そのきらめきは火のきらめき、最もはげしい炎です。 (Sheol h7585)
Tụkwasị m dịka mgbaaka ihe a kara nʼobi, dịka mgbaaka ihe a kara nʼaka gị nʼihi na ịhụnanya dị ike dịka ọnwụ, ekworo ya dịkwa ike dịka ala mmụọ. Ọ na-enwupụtakwa dịka ọkụ na-ere ere, dịka ọkụ nke dị ukwu. (Sheol h7585)
7 愛は大水も消すことができない、洪水もおぼれさせることができない。もし人がその家の財産をことごとく与えて、愛に換えようとするならば、いたくいやしめられるでしょう。
Ọtụtụ mmiri apụghị imenyụ ịhụnanya, osimiri niile enwekwaghị ike iri ya. Ọ bụrụ na mmadụ ga-enye akụ niile nke ụlọ ya nʼihi ịhụnanya, a ga-eleda ya anya nke ukwuu.
8 わたしたちに小さい妹がある、まだ乳ぶさがない。わたしたちの妹に縁談のある日には、彼女のために何をしてやろうか。
Anyị nwekwara otu nwanne nwanyị nta ma ọ kpụbeghị ara. Gịnị ka anyị ga-emere nwanne anyị nwanyị, nʼụbọchị a ga-abịa ịlụ ya?
9 彼女が城壁であるなら、その上に銀の塔を建てよう。彼女が戸であるなら、香柏の板でそれを囲もう。
Ọ bụrụ na ọ bụ mgbidi, anyị ga-ewukwasị ụlọ elu ọlaọcha nʼelu ya; ma ọ bụrụ na ọ bụ ọnụ ụzọ, anyị ga-eji ibo e ji osisi sida wuo mechie ya, ichebe ya.
10 わたしは城壁、わたしの乳ぶさは、やぐらのようでありました。それでわたしは彼の目には、平和をもたらす者のようでありました。
Abụ m mgbidi, ara m abụọ guzokwa dịka ụlọ elu. Otu a ka m siri dị nʼanya ya dịka onye na-ewetara ya afọ ojuju.
11 ソロモンはバアルハモンにぶどう園をもっていた。彼はぶどう園を、守る者どもにあずけて、おのおのその実のために銀一千を納めさせた。
Solomọn nwere ubi vaịnị na Baal-Hamon, o nyefere ubi vaịnị ya nʼaka ndị ọrụ nlekọta. Onye ọbụla nʼime ha ga-eweta puku shekel ọlaọcha maka mkpụrụ ọ na-amịta.
12 わたしのものであるぶどう園は、わたしの前にある。ソロモンよ、あなたは一千を獲るでしょう、その実を守る者どもは二百を獲るでしょう。
Ma ubi vaịnị m bụ nke aka m. Ana m enye ya onye m chọrọ inye. Puku ọlaọcha bụ nke Solomọn, ndị ọrụ ubi ga-enwetakwa narị ọlaọcha abụọ.
13 園の中に住む者よ、わたしの友だちはあなたの声に耳を傾けます、どうぞ、それをわたしに聞かせてください。
Gị onye bi nʼubi a gbara ogige, gị na ndị enyi gị, kwere ka m nụ olu gị.
14 わが愛する者よ、急いでください。かんばしい山々の上で、かもしかのように、また若い雄じかのようになってください。
Soro m ka anyị pụọ, onye m hụrụ nʼanya, bịakwute m dịka mgbada, maọbụ dịka nwa ele na-awụgharị nʼelu ugwu ebe ụda dị iche iche na-esi isi ụtọ jupụtara.

< 雅歌 8 >