< کارهای رسولان 24 >

و بعد از پنج روز، حنانیای رئیس کهنه با مشایخ و خطیبی ترتلس نام رسیدندو شکایت از پولس نزد والی آوردند. ۱ 1
Mgbe ụbọchị ise gasịrị, onyeisi nchụaja bụ Ananayas na ụfọdụ ndị okenye ndị Juu na lọya ha aha ya bụ Tatulọs bịara. Ha dum pụtara ịgbagide Pọl ama nʼihu onye na-achị obodo.
و چون اورا احضار فرمود، ترتلس آغاز ادعا نموده، گفت: چون از وجود تو در آسایش کامل هستیم واحسانات عظیمه از تدابیر تو بدین قوم رسیده است، ای فیلکس گرامی، ۲ 2
Mgbe a kpọbatara ya, Tatulọs pụtara guzo boo ya ebubo sị, “Onye a na-asọpụrụ ka ị bụ. Nʼihi gị, mmadụ niile enwela udo ogologo mgbe. Ịdị nkọ nke uche gị emeela ka mgbanwe dị nʼobodo a.
در هر جا و در هروقت این را در کمال شکرگذاری می‌پذیریم. ۳ 3
Anyị ji ekele nke jupụtara nʼọṅụ na-anabata ihe ndị a nke ọma, nʼebe niile na nʼụzọ niile, gị Feliks, onye a na-asọpụrụ.
ولیکن تا تو را زیاده مصدع نشوم، مستدعی هستم که از راه نوازش مختصر عرض ما را بشنوی. ۴ 4
Achọghị m itufu oge gị. Ana m arịọ ka i were ndidi na obiọma nụrụ nkenke okwu anyị ji bịa.
زیرا که این شخص را مفسد و فتنه انگیز یافته‌ایم در میان همه یهودیان ساکن ربع مسکون و ازپیشوایان بدعت نصاری. ۵ 5
“Anyị chọpụtara na nwoke a bụ onye na-akpalikarị ọgbaaghara, onye ọrụ ya bụ ịkwagide ndị Juu nọ nʼebe niile nʼụwa a ka ha nupu isi. Ọ bụkwa onyeisi nke ajọ otu ahụ a na-akpọ Otu ndị Nazaret.
و چون او خواست هیکل را ملوث سازد، او را گرفته، اراده داشتیم که به قانون شریعت خود بر او داوری نماییم. ۶ 6
Ọ chọkwara imerụ ụlọnsọ anyị, ya mere anyị ji jide ya. Ma anyị chọrọ ikpe ya ikpe dịka omenaala anyị siri dị,
ولی لیسیاس مین باشی آمده، او را به زور بسیار ازدستهای ما بیرون آورد، ۷ 7
ọchịagha Lisias, bịara jiri ike napụ ya nʼaka anyị.
و فرمود تا مدعیانش نزد تو حاضر شوند؛ و از او بعد از امتحان می‌توانی دانست حقیقت همه این اموری که ما براو ادعا می‌کنیم.» ۸ 8
Ọ bụrụ na inyochaa ya, ị ga-enwe ike ịghọta ihe niile banyere ebubo anyị na-ebo ya.”
و یهودیان نیز با او متفق شده گفتند که چنین است. ۹ 9
Ndị Juu kwadokwara okwu ya, na ihe niile e boro ya, bụ ihe mere eme.
چون والی به پولس اشاره نمود که سخن بگوید، او جواب داد: «از آن رو که می‌دانم سالهای بسیار است که تو حاکم این قوم می‌باشی، به خشنودی وافر حجت درباره خود می‌آورم. ۱۰ 10
Mgbe gọvanọ feere ya aka ka o kwuo okwu, Pọl zara, “amaara m na ị bụ onye ọkaikpe nke mba a ogologo mgbe. Nke a na-enye m obi ụtọ ịgọpụ onwe m nʼihu gị.
زیرا تو می‌توانی دانست که زیاده از دوازده روز نیست که من برای عبادت به اورشلیم رفتم، ۱۱ 11
Ị pụrụ ịchọpụta na o rubeghị ụbọchị iri na abụọ kemgbe m rigooro nʼụlọnsọ ukwu na Jerusalem ife ofufe.
و مرا نیافتند که در هیکل با کسی مباحثه کنم ونه در کنایس یا شهر‌که خلق را به شورش آورم. ۱۲ 12
Ha ahụghị m ka mụ na onye ọbụla na-arụrịta ụka nʼụlọnsọ, maọbụ na o nwere ebe m kpatara ọgbaaghara nʼime ụlọ nzukọ, maọbụ ebe ọbụla nʼime obodo.
و هم آنچه الان بر من ادعا می‌کنند، نمی تواننداثبات نمایند. ۱۳ 13
Ha enwekwaghị ihe ọbụla ha ga-eji kwagide ama ha na-agba megide m.
لیکن این را نزد تو اقرار می‌کنم که به طریقتی که بدعت می‌گویند، خدای پدران را عبادت می‌کنم و به آنچه در تورات و انبیامکتوب است معتقدم، ۱۴ 14
Agaghị m agọ agọ nʼihu gị na m na-ekpere Chineke nke nna anyị ha, dịka onye na-eso Ụzọ ahụ ha na-akpọ otu. Ekwenyere m ihe niile dịka usoro nke iwu si dị, na nke e dere nʼakwụkwọ ndị amụma.
و به خدا امیدوارم چنانکه ایشان نیز قبول دارند که قیامت مردگان ازعادلان و ظالمان نیز خواهد شد. ۱۵ 15
Ma enwere m olileanya nʼebe Chineke nọ dịka ha onwe ha nwekwara, na mbilite nʼọnwụ nke ndị ezi omume na nke ndị ajọ omume ga-adị.
و خود را دراین امر ریاضت می‌دهم تا پیوسته ضمیر خود رابه سوی خدا و مردم بی‌لغزش نگاه دارم. ۱۶ 16
Nʼihi nke a, a na m agbalị inwe akọnuche dị ọcha nʼihu Chineke na nʼihu mmadụ niile.
و بعداز سالهای بسیار آمدم تا صدقات و هدایا برای قوم خود بیاورم. ۱۷ 17
“Ugbu a, mgbe ọtụtụ afọ gasịrị, abịara m Jerusalem iwetara ndị nke m onyinye, nakwa ịchụrụ Chineke aja.
و در این امور چند نفر ازیهودیان آسیا مرا در هیکل مطهر یافتند بدون هنگامه یا شورشی. ۱۸ 18
Emezuola m omenaala ịdị ọcha mgbe ha hụrụ m nʼụlọnsọ ukwu ahụ mgbe m na-eme nke a. Ọ dịkwaghị igwe mmadụ so m maọbụ na m sonyere ọgbaaghara ọbụla.
و ایشان می‌بایست نیز دراینجا نزد تو حاضر شوند تا اگر حرفی بر من دارندادعا کنند. ۱۹ 19
Ma enwere ụfọdụ ndị Juu si Eshịa bịa, bụ ndị kwesiri ịnọ nʼebe a ma ọ bụrụ na ha nwere ihe ọbụla megide m.
یا اینان خود بگویند اگر گناهی ازمن یافتند وقتی که در حضور اهل شورا ایستاده بودم، ۲۰ 20
Maọbụ ndị nke nọ nʼebe a ugbu a, ka ha kwuo ajọ omume ọbụla ha hụrụ nʼime m mgbe m guzoro nʼihu ndị nzukọ ndị okenye.
مگر آن یک سخن که در میان ایشان ایستاده، بدان ندا کردم که درباره قیامت مردگان ازمن امروز پیش شما بازپرس می‌شود.» ۲۱ 21
Karịa na m kwuru naanị otu ihe mgbe m guzoro nʼihu ha tie mkpu, ‘A na-ekpe m ikpe taa nʼihi okwukwe m na mbilite nʼọnwụ nke ndị nwụrụ anwụ.’”
آنگاه فیلکس چون از طریقت نیکوترآگاهی داشت، امر ایشان را تاخیر انداخته، گفت: «چون لیسیاس مین باشی آید، حقیقت امر شما را دریافت خواهم کرد.» ۲۲ 22
Mgbe ahụ, Feliks onye maara ihe banyere Ụzọ ahụ nke ọma yigharịrị ikpe a. Ọ gwara ha, “Aga m eleba anya nʼikpe gị a, mgbe Lisias onyeisi agha bịara.”
پس یوزباشی را فرمان داد تا پولس را نگاه دارد و او را آزادی دهد واحدی از خویشانش را از خدمت و ملاقات اومنع نکند. ۲۳ 23
O nyere ọchịagha ahụ iwu ka e debe ya nʼokpuru nlekọta ha. Ma ka ha nye ya ohere inwere onwe ya ime ụfọdụ ihe, ka ha kwekwa ka ndị enyi ya bịa nyere ya aka gboo mkpa ya.
و بعد از روزی چند فیلکس با زوجه خود درسلا که زنی یهودی بود، آمده پولس راطلبیده، سخن او را درباره ایمان مسیح شنید. ۲۴ 24
Mgbe ụbọchị ole na ole gasịrị, Feliks na nwunye ya Drusila, bụ onye Juu bịara, ọ kpọrọ Pọl ka ọ gwa ha okwu banyere inwe okwukwe nʼime Jisọs Kraịst.
وچون او درباره عدالت و پرهیزکاری وداوری آینده خطاب می‌کرد، فیلکس ترسان گشته، جواب داد که «الحال برو چون فرصت کنم تو راباز خواهم خواند.» ۲۵ 25
Ma mgbe ọ gara nʼihu na-ekwu ihe banyere ezi omume na mkpa ọ dị mmadụ ijide onwe ya aka, ya na ihe banyere ụbọchị ikpe nke na-abịa nʼoge ikpeazụ, egwu jidere Feliks. Ọ sịrị, “I nwere ike ịpụ ugbu a. Aga m akpọkwa gị nʼoge ọzọ mgbe m nwetara ohere.”
و نیز امید می‌داشت که پولس او را نقدی بدهد تا او را آزاد سازد و از این جهت مکرر وی را خواسته، با او گفتگو می‌کرد. ۲۶ 26
Ọ na-atụkwa anya na Pọl ga-enye ya ego. Ya mere o jiri na-eziga ka a na-akpọ ya site nʼoge ruo nʼoge ka ya na ya na-akparịta ụka.
اما بعد از انقضای دو سال، پورکیوس فستوس، خلیفه ولایت فیلکس شد و فیلکس چون خواست بر یهود منت نهد، پولس را در زندان گذاشت. ۲۷ 27
Mgbe afọ abụọ gasịrị, onye a na-akpọ Pọshiọs Festọs nọchiri anya Feliks. Ma ebe ọ chọrọ inweta ihuọma nʼaka ndị Juu, Feliks hapụrụ Pọl nʼụlọ mkpọrọ.

< کارهای رسولان 24 >