< داوران 17 >

و از کوهستان افرایم شخصی بود که میخا نام داشت. ۱ 1
E nwere otu nwoke si nʼala ugwu ugwu Ifrem, aha ya bụ Maịka.
و به مادر خود گفت: «آن هزار و یکصد مثقال نقره‌ای که از تو گرفته شد، و درباره آن لعنت کردی و در گوشهای من نیز سخن گفتی، اینک آن نقره نزد من است، من آن را گرفتم.» مادرش گفت: «خداوند پسر مرا برکت دهد.» ۲ 2
Otu ụbọchị, Maịka gwara nne ya okwu sị ya, “I chetara puku na narị ego ọlaọcha shekel ndị ahụ funarịrị gị, nke i ji nʼihi ya bụọ onye zuru ya ọnụ nʼoge gara aga? Eji m ọlaọcha ahụ. Ọ bụ m weere ya.” Nne ya sịrị, “Ka Onyenwe anyị gọzie gị nwa m!”
پس آن هزار و یکصد مثقال نقره را به مادرش رد نمود و مادرش گفت: «این نقره را برای خداوند از دست خود به جهت پسرم بالکل وقف می‌کنم تا تمثال تراشیده و تمثال ریخته شده‌ای ساخته شود، پس الان آن را به تو باز می‌دهم.» ۳ 3
Mgbe o nyeghachiri nne ya puku na narị ego ọlaọcha shekel ahụ, nne ya gwara ya sị, “Ana m edo ọlaọcha ndị a nsọ nye Onyenwe anyị nʼihi nwa m nwoke maka iji ya mee oyiyi a pịrị apị na arụsị a kpụrụ akpụ. Aga m emesịa nyeghachi gị ya.”
وچون نقره را به مادر خود رد نمود، مادرش دویست مثقال نقره گرفته، آن را به زرگری داد که او تمثال تراشیده، و تمثال ریخته شده‌ای ساخت و آنها در خانه میخا بود. ۴ 4
Ya mere, o nyeghachiri nne ya ọlaọcha ahụ, Nne ya weere narị ego ọlaọcha shekel abụọ wegara ọkpụ ụzụ ọlaọcha, onye jiri ya mee oyiyi a pịrị apị na ihe a kpụrụ akpụ. E tinyere ha nʼụlọ Maịka.
و میخا خانه خدایان داشت، و ایفود و ترافیم ساخت، و یکی از پسران خود را تخصیص نمود تا کاهن او بشود. ۵ 5
Nwoke ahụ bụ Maịka nwere ụlọ arụsị, o mere efọọd na arụsị ezinaụlọ dị iche iche, mee otu nʼime ụmụ ya ndị ikom ka ọ bụrụ onye nchụaja ya.
و در آن ایام در اسرائیل پادشاهی نبود و هر کس آنچه درنظرش پسند می‌آمد، می‌کرد. ۶ 6
Nʼụbọchị ndị a, Izrel enweghị eze na-achị ha. Nʼihi nke a, onye ọbụla na-eme ihe ọbụla ọ chọrọ, na ihe ọbụla dị ya mma nʼanya.
و جوانی از بیت لحم یهودا از قبیله یهودا و ازلاویان بود که در آنجا ماوا گزید. ۷ 7
Otu nwokorobịa onye Livayị, sitere nʼobodo Betlehem nke dị na Juda, bụ onye binyere ndị agbụrụ Juda,
و آن شخص ازشهر خود، یعنی از بیت لحم یهودا روانه شد، تاهر جایی که بیابد ماوا گزیند، و چون سیر می‌کردبه کوهستان افرایم به خانه میخا رسید. ۸ 8
hapụrụ obodo ahụ, bụ Betlehem Juda ịchọ ọnọdụ nʼebe ọzọ. Mgbe ọ na-aga, ọ bịaruru nʼụlọ Maịka nʼala ugwu ugwu Ifrem.
و میخا اورا گفت: «از کجا آمده‌ای؟» او در جواب وی گفت: «من لاوی هستم از بیت لحم یهودا، ومی روم تا هر جایی که بیابم ماوا گزینم.» ۹ 9
Maịka jụrụ ya, “Ebee ka i si bịa?” Ọ sịrị “Abụ m onye Livayị si Betlehem dị na Juda. Ana m achọrọ onwe m ebe m ga-anọ.”
میخااو را گفت: «نزد من ساکن شو و برایم پدر و کاهن باش، و من تو را هر سال ده مثقال نقره و یک دست لباس و معاش می‌دهم.» پس آن لاوی داخل شد. ۱۰ 10
Mgbe ahụ, Maịka sịrị ya, “Soro biri nʼụlọ m, ghọkwara m nna na onye nchụaja, aga m akwụ gị mkpụrụ ego ọlaọcha shekel iri kwa afọ, nyekwa gị uwe, na ihe oriri.”
و آن لاوی راضی شد که با او ساکن شود، و آن جوان نزد او مثل یکی از پسرانش بود. ۱۱ 11
Ya mere, onye Livayị ahụ kwere nʼihe ọ gwara ya, nwokorobịa ahụ sooro ya biri ka otu nʼime ụmụ ya ndị ikom.
و میخاآن لاوی را تخصیص نمود و آن جوان کاهن اوشد، و در خانه میخا می‌بود. ۱۲ 12
Mgbe ahụ, Maịka nyere onye Livayị ahụ ọrụ, nwokorobịa ahụ ghọọrọ ya onye nchụaja, birikwa nʼụlọ ya.
و میخا گفت: «الان دانستم که خداوند به من احسان خواهد نمود زیرالاوی‌ای را کاهن خود دارم.» ۱۳ 13
Mgbe ahụ, Maịka kwuru, “Ugbu a, amaara m na Onyenwe anyị ga-agọzi m nke ukwuu, nʼihi na onye Livayị a aghọọla onye nchụaja m.”

< داوران 17 >